Mufananidzo weYouVersion
Mucherechedzo Wekutsvaka

JENESIS 5

5
1Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N'ubọchi Chineke kere madu, n'oyiyi Chineke ka O mere ya; 2nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha. 3Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set: 4ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom. 5Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.
6Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh: 7Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 8ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.
9Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan: 10Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 11ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.
12Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel: 13Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 14ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua.
15Mahalalel di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Jered: 16Mahalalel di ndu, mb͕e ọ musiri Jered, nnù arọ abua na oru na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 17ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua.
18Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok: 19Jered di ndu, mb͕e ọ musiri Inok, nnù arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 20ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.
21Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela: 22Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 23ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise: 24Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.
25Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek: 26Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 27ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua.
28Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke: 29ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu. 30Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: 31ubọchi nile nke Lemek we buru nnù arọ na ọgu iri-na-asatọ na arọ iri na asa: o we nwua. 32Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.

Zvasarudzwa nguva ino

JENESIS 5: IGBOB

Sarudza vhesi

Pakurirana nevamwe

Sarudza zvinyorwa izvi

None

Unoda kuti zviratidziro zvako zvichengetedzwe pamidziyo yako yose? Nyoresa kana kuti pinda