1
Ọrụ Ndị Ozi 2:38
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Compare
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:38
2
Ọrụ Ndị Ozi 2:42
Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:42
3
Ọrụ Ndị Ozi 2:4
Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:4
4
Ọrụ Ndị Ozi 2:2-4
Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:2-4
5
Ọrụ Ndị Ozi 2:46-47
Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:46-47
6
Ọrụ Ndị Ozi 2:17
“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:17
7
Ọrụ Ndị Ozi 2:44-45
Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ. Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:44-45
8
Ọrụ Ndị Ozi 2:21
Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:21
9
Ọrụ Ndị Ozi 2:20
Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 2:20
Home
Bible
Plans
Videos