1
1 Samuel 17:45
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa 1 Samuel 17:45
2
1 Samuel 17:47
Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
Nyochaa 1 Samuel 17:47
3
1 Samuel 17:37
ONYENWE ANYị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYị nọnyere gị.”
Nyochaa 1 Samuel 17:37
4
1 Samuel 17:46
Taa ka ONYENWE ANYị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.
Nyochaa 1 Samuel 17:46
5
1 Samuel 17:40
Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.
Nyochaa 1 Samuel 17:40
6
1 Samuel 17:32
Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
Nyochaa 1 Samuel 17:32
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị