Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iwu Ndị E Mebere Banyere Otu E Si Eji Ngwá Ma Ọ Bụ Ihe E Mepụtara Eme Ihe

Emezigharịrị Ikpeazụ na Eprel 2, 2020

Dịka ekwuru na iwu anyị dị n'okpuru, Iwu Nzuzo na Iwu Banyere Ngwá anyị bụ nke Asụsụ Bekee ga-achịkwa mmekọrịta gị na YouVersion. N'agbanyeghị na ọ bụ Asụsụ Bekee ga-achịkwa, ị nwekwara ike iji ngwá ntụgharị akpaka dị ka Google Translate iji lelee dọkụmentị gasị n'asụsụ gị. A ga-ebipụta nleghari banyere ntụgharị asụsụ ọ bụla emere na peeji a.


Nnabata Nke Iwu Ndị A E Mebere Banyere Otu E Si Eji Ihe Eme Ihe Ma Ọ Bụ Arụ Ọrụ

Site n'iji saịtị-gasị YouVersion, savis ya gasị, na ngwá mobaịl ya gasị (ha niile ka ana-akpọ, “YouVersion”), èmé ihe, ma ị̀bụ̀ onye ọbịa ma ị̀bụ̀ onye n'eji ngwá èmé edebanyerè aha ya, ịnà ànabatá nà èkwenyé ka Iwu ndịa jigide gị. Biko gụọ Iwu ndịa nke ọma tupu gị amalite iji YouVersion wee mewe ihe, makwà Iwu Nzuzo Nke YouVersion. Ọ bụrụ na ị̀ kwenyeghị na Iwu ndịa ma ọbụ̀ na Iwu Nzuzo Nke YouVersion, ị̀ kwesịghị inweta ohere na YouVersion ma ọbụ̀ jírí ya mee ihe.

Mgbanwè-Gasị Emerè Na Iwu

Ọ bụ̀ Arụmihe-Gasị Life.Church, LLC (“Life.Church”, “we” ma ọbụ̀ “us”) nà-ènyé YouVersion. Anyị nwerè ike nyòchagharia ma melite Iwu ndịa site n'oge ruo n'oge dịka anyị sịrị tụọ. Mgbanwè ọbụla nà-àdị́ irè mgbe anyị postùrù ha. Nnọgide gị iji YouVersion ná-èmé ihe ka epostùcharà Iwu ndị emecharà mgbanwè-gasị na ha pụtarà na ị nabatarà na kwenye na mgbanwè ndị emerè.

Ebe YouVersion nyerè gị ntụgharị-asụsụ n'abụghị ntụgharị-asụsụ Bekee nke Iwu Bànyeré Etù Esi Eji Ngwá Èmé Ihe, ịna èkwenyé na enyerè ntụgharị-asụsụ ahụ naanị maka ọ̀dị̀mma gị, nakwà na ntụgharị Iwu Bànyeré Etù Esi Eji Ngwá Èmé Ihe na asụsụ Bekee gà-achịkwa mmekọrịta gị na YouVersion. Ọ bụrụ na enwerè mgbagha n'etiti ihe ntụgharị Iwu Bànyeré Etù Esi Eji Ngwá Eme Ihe n'asụsụ Bekee n'èkwú na nke ntụgharị ọzọ n'èkwú, ọ bụ̀ nke asụsụ Bekee ka aga éwèré.

Mgbanwè-Gasị Emerè YouVersion

Ọ bụ̀ ezie na anyị nwerè olileanya inye YouVersion na ihe-ngosi ya niile mgbe niile, anyị nwerè ikike ịgbanwè YouVersion ma ọbụ̀ ịkwụsị inye YouVersion ma ọbụ̀ akụkụ ya ọbụla ma ọbụ̀ arụmọrụ ya n'enyeghị ọkwá ọbụla. Iwu agaghị ama anyị ma ọbụrụ na ya enwee ihe kpatara akụkụ niile ma ọbụ̀ akụkụ ọbụla nke YouVersion adịghị adị n'oge ọbụla.

Ozi Bànyeré Gị Na Nweta Ohere Gị Na YouVersion

Ozi niile anyị nà-ànakọtá nà ma ọbụ̀ site na YouVersion nà-èruberé Iwu Nzuzo anyị isi. Site n'iji YouVersion èmé ihe, ịna èkwenyé na ihe niile anyị merè dị́ nkwekọ na Iwu Nzuzo.

Òjìjì Enyerè Ikike Maka Ya Na Nke Ana Enyeghị Ikike

Ị nwerè ike iji YouVersion mee ihe n'ụzọ kwekọrọ na Iwu ndịa maka òjìjì nke-onwe gị na ụzọ n'abụghị nke azụmahịa ma ọbụ̀ òjìjì-ime nke nzukọ okpukperechi gị n'adịghị èmé ihe iji nata ego. Ikike niile ana enyeghị gị n'ụzọ doro anya bụ̀ nke dị́ị́rị́ na nọgide n'ikike Life.Church. Ịnà èkwenyé na ènyeghị gị ikike, nakwa iji YouVersion mee ihe n'ụzọ dị otù a:

  • n'ụzọ ọbụla megidere iwu ọbụla nke fedral ma ọbụ̀ iwu steeti, iwu mpaghara, ma ọbụ̀ iwu mba ụwa ma ọbụ̀ règùléshịọn ha;
  • maka ebumnuche nke iji mee ihe n'ụzọ dị́ aghụghọ, imerụ ahụ, ma ọ bụ̀ ịnwa iji ghọgbuo ma ọbụ̀ merụọ ụmụaka ahụ n'ụzọ ọbụla site n'ikpugherè ha ma ọbụ̀ gosi ha ọdịnaya na-ekwesịghị ekwesị, ịrịọ ha maka ozi njirimara nkeonwe, ma ọbụ̀ ihe ọzọ;
  • isi na ịbụ̀ onye ịna abụghị ma ọbụ̀ ịnwa ịbụ́ onye ịna abụghị ma ọbụ̀ ụlọ-ọrụ ọbụla, gụnyere Life.Church ma ọbụ̀ onye ọzọ n'eji YouVersion èmé ihe;
  • itinyè aka n'omume ọbụla ọzọ nke, dịka anyị kpebìrì, nwerè ike imerụ Life.Church ma ọbụ̀ ndị ọzọ n'eji YouVersion èmé ihe ahụ ma ọbụ̀ mee ha ka ha bụrụ ndị iwu màrá;
  • n'ụzọ ọbụla nwéré ike ime ka YouVersion kwụsị ịrụ ọrụ, nye ya ibu karịrị ya, mebie ya, ma ọbụ̀ mee ya ka ọ dị njọ n'anya ndị mmadụ ma ọbụ̀ tinye-aka n'ụzọ n'ekwesịghị ekwesị n'òjìjì onye ọbụla ọzọ nke YouVersion;
  • iji robọt ọbụla, spaidà ọbụla, ma ọbụ̀ ngwaọrụ ọbụla n'émé ihe akpaghị-aka, usoro ọbụla, ma ọbụ̀ ụzọ ọbụla iji nweta ohere na YouVersion maka ebumnobi ọbụla, gụnyere ínyò ma ọbụ̀ ịkọpị ihe ọbụla dị́ na YouVersion;
  • iwebatà vairọs ọbụla gasị, Trojan Horse ọbụla gasị, wọm gasị, lọjik bọmbụ gasị, ma ọbụ̀ ihe ọbụla ọzọ dị́ ezigbote njọ ma ọbụ̀ nke pụrụ imebi ihe n'ụzọ teknọlọji;
  • ịnwà inweta ohere ana enyeghị ikike bànyeré ya na YouVersion, itinyè aka n'ụzọ n'ekwesịghị ekwesị na ya, imebi, ma ọbụ̀ ime ka akụkụ ya obula ma ọbụ̀ sava ọbụla, kọmputa ọbụla, ma ọbụ̀ databez ọbụla jikọtara na YouVersion kwụsị ịrụ ọrụ;
  • imegide YouVersion site na mmegide nke njụ-inye-savis ma ọbụ̀ nkesa nke mmegide njụ-inye-savis; na
  • ịnwà ihe ọbụla ọzọ iji tinye-aka n'ekwesịghị ekwesị iji mebie arụmọrụ dị́ mma nke YouVersion.

Ịnà èkwetakwá na ị gaghị ezipụ, mara amara nata, bugolite, budata, jírí mee ihe, ma jighariá mee ihe, ihe ọbụla nke:

  • nwéré ihe ọbụla nke n'ekwu okwu megide mmadụ, nke rụrụ arụ, nke n'adịghị mma ile anya, nke dị́ mkparị, nke na-akpasu iwe, nke n'anọgide n'ényé mmadụ nsogbu, nke dị́ iwe ọkụ, nke dị́ ịkpọ asị, nke n'akpali ihe n'adịghị mma, ma ọbụ̀ nke n'adịghị mma n'ezie;
  • nke n'akwado ihe n'egosi mmekọahụ na mmekọrịta nwoke na nwaanyị n'ụzọ rụrụ arụ, nke n'akwado ihe ike, ma ọbụ̀ ikpa-ókè n'ụzọ ọbụla, gụnyere nke agbụrụ, ndabara okike, okpukperechi, obodo onye sì bịa, nkwarụ ahụ, nhọrọ nke mmekọahụ, ma ọbụ̀ afọ ole mmadụ dị̀;
  • nke n'emegide iwu nke patentị, tredmakị, ihe nzuzo azụmahịa, kọpịraịt, ma ọbụ̀ onwunwe-ọgụgụ-ịsị ọbụla ma ọbụ̀ ikike ọbụla ọzọ nke onye ọbụla ọzọ;
  • nke n'emegide ikike-gasị iwu nyerè (gụnyere ikike-gasị nke ọha na nke nzuzo) nke ndị ọzọ ma ọbụ̀ nke nwéré ihe ọbụla nwéré ike ịkpatá ọdịdà n'anya iwu nke sivụl ma ọbụ̀ kriminàl n'okpuru iwu na ihe ndị akarà n'ike iwu;
  • nke n'akwalite omume ọbụla iwu n'akwadoghị, ma ọbụ̀ nke n'ekwúrú, n'akwalite, ma ọbụ̀ ènyeré omume ọbụla iwu n'akwadoghị aka;
  • nke gụnyere omume ire-ahịa na azụmahịa gasị, dịka asọmpi gasị, ọ̀zụ́zụ́ na nchịkọta-gasị ihe ndị ana ere n'ụzọ dị́ ezigbote ọnụ-ego ala, na nkwalite azụmahịa gasị ana èmé, nye m nke iji wee nàrá nke m ji, ma ọbụ̀ mgbasa-ozi n'amụta ego; na/ma ọbụ̀
  • nke n'émé ka àgà asị na yabụ́ ihe siterè na Life.Church ma ọbụ̀ na Life.Church ma ọbụ̀ onye ọbụla ọzọ ma ọbụ̀ ụlọ-ọrụ ọbụla ọzọ kwadorò ya, ọ bụrụ na nke ahụ abụghị eziokwu.

Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe

YouVersion nwerè ihe-ngosi gasị n'akwado ma n'akpalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke n'ekwe ka ndị n'eji ngwá èmé ihe postụo ihe, nyefee ihe, bipụta ihe, gosipụta ihe, ma ọbụ̀ bufee ihe nye ndị ọzọ n'eji ngwá èmé ihe ma ọbụ̀ ọdịnaya na ihe nke ndị ọzọ (ana akpọkọta, “Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe”) na ma ọbụ̀ site na YouVersion. Otù ọ dị̀, anyị adịghị ekwe nkwa inyochà Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe na ọbụ̀ ihe ọbụla ọzọ tupu è postụo ya na ma ọbụ̀ site na YouVersion, ma anyị adịghị ekwe nkwa iwepụ ihe ọbụla n'adịghị mma ngwa ngwa mgbe e postụcharà ya na YouVersion. Ya merè, iwu adịghị na agaghị ama anyị maka ihe ọbụla emerè ma ọbụ̀ nke ana emeghị gbàsará mbufè gasị, nzikọrịta-ozi gasị, ma ọbụ̀ ọdịnaya onye ọbụla n'eji ngwá èmé ihe ma ọbụ̀ nke onye ọzọ nyerè.

Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe niile gà-èkwekọrịrị́ n'iwu ndịa. Site n'inye Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe ọbụla na, ma ọbụ̀ site na YouVersion, ịna ènyé anyị na ndị n'enye anyị savis, na kwà ndị ha na anyị nyerè ikike gasị, ndị nnọchiteanya anyị gasị, na ndị gasị anyị kenyerè ihe, ikike iji wee mee ihe, mepụta ọzọ, megharịa, kpọọ, gosipụta, nye ikike, kesaa, na n'ụzọ ọbụla ọzọ gosi nye ndị ọzọ ihe ọbụla dị́ otù ahụ iji nye YouVersion. Ịnà ègosipụtá na èkwenyé na ọbụ̀ gị nwe na dị́ nchịkwa n'elu ikike niile dị́ n'ime na nke metụtara Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe ma nwee ikike inye ikike a nakwà na Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe gị niile n'èkwekọ́ ma gà-anọgide n'èkwekọ́ na Iwu ndịa. Ọ bụghị anyị ka ọ gbasarà ma iwu agaghị ama anyị n'aka onye ọzọ maka ọdịnaya ma ọbụ̀ izi-ezi Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe ọbụla gị ma ọbụ̀ onye ọbụla ọzọ n'eji YouVersion èmé ihe postùrù.

Nchekwa Akaụntụ

YouVersion n'èkwé ka ndị n'eji ngwá èmé ihe mepụta akaụntụ (“Ndị Otù”) nke ná-ágụnyé inye Life.Church ụfọdụ ozi. Ọ bụrụ na gị ahọrọ ma ọbụ̀ e nyerè gị aha njirimara, paswọọdụ, ma ọbụ̀ ozi yiri ha dịka usoro nchekwa anyị gasị, ịna èkwenyé ijigidè na debe ụdị ozi ahụ nchebe, ma n'èkwenyé ịgwa anyị ozugbo e nwerè ikike ịna enyeghị ma ọbụ̀ òjìjì ịna ekwenyeghị na ya nke aha njirimara gị ma ọbụ̀ paswọọdụ ma ọbụ̀ mmebi ọbụla nke nchekwa. Anyị nwerè ikike ịkwụsị òjìjì nke aha njirimara ọbụla, paswọọdụ ọbụla, ma ọbụ̀ ihe ọbụla a pụrụ̀ iji mara mmadụ, ma ọbụ̀ gị họọrọ̀ ya ma ọbụ̀ anyị nyerè, n'oge ọbụla ọ bụrụ na, n'uche anyị, i mebìrì akụkụ ọbụla nke Iwu ndịa.

Nlebà-Anya Na Mmanye Ime Iwu; Nrubeisi Nye Iwu; Nkwụsị

Ịnà èkwenyé na anyị nwerè ikike:

  • mee ihe ọbụla metụtara onye ọbụla n'eji ngwá èmé ihe, akaụntụ nke ịbụ́ Onye Otù, ma ọbụ̀ Ntinye-Aka Nke Onye N'eji Ngwá Èmé Ihe anyị hụtarà ka ọ dị mkpa ma ọbụ̀ kwesị ekwesị n'uche nke anyị ọ bụrụ na anyị kwerè na enwerè mmebi Iwu Ndịa merenụ, mmegide nke ikike nke ndị ọzọ, iyi-egwù nye nchekwa nkeonwe nke ndị ọzọ, ma ọbụ̀ iyi-egwù, ọdịdà n'ụzọ iwu, ma ọbụ̀ nye ọ̀dị̀mma metụtara YouVersion ma ọbụ̀ Life.Church;
  • mee ihe kwesịrị ekwesị, gụnyere ma n'enweghị ókè, ntụ̀-aka nye ndị mmanye iwu na mkpughe nke ozi gị, maka òjìjì YouVersion n'ụzọ iwu n'akwadoghị ma ọbụ̀ ana enyeghị ikike; na/ma ọbụ̀
  • kwụsị kpamkpam ma ọbụ̀ kwụsị nwa oge ohere gị inweta akụkụ niile ma ọbụ̀ ụfọdụ nke YouVersion ma enwerè ihe kpatara ya ma enweghị ihe kpatara ya, gụnyere ma n'enweghị ókè, mmebi ọbụla nke Iwu ndịa.

N'enweghị ókè n'ihe ndịa ana akọwapụta, anyị nwerè ikike ijikọta-aka, nye nkwado ma rụkọọ ọrụ nke ọma, anyị na ndị mmanye na ikike iwu ọbụla ma ọbụ̀ iwu ụlọ ikpe ọbụla n'arịọ ma ọbụ̀ n'enye anyị iwu ka anyị kpughee njirimara ma ọbụ̀ ozi ọzọ nke onye ọbụla ná-épostù ihe ọbụla na ma ọbụ̀ site na YouVersion. ỊNÀ ASÍ KA AGHARA IJIDÈ MA ỌBỤ̀ MAA LIFE.CHURCH IWU, YA NA NDỊ O NYERÈ IKIKE NA NDỊ N'ENYE YA SAVIS NA NDỊ ỌRỤ YA NIILE, NDỊ ISI HA NIILE, NA NDỊ NCHỊKWA HA NIILE N'AKA EGO ỌBỤLA ASÍ KWỤỌ SITERÉ N'IHI IWU NKE NDỊ ỌBỤLA AKPỌRỌ AHA HA N'ELU MERÈ N'OGE NA ỌBỤ̀ SITE NA NCHỌPỤTA IWU NA SITE NA IHE ỌBỤLA ÉWÈRÈLÀ DỊKA MPỤTA NKE NCHỌPỤTA-GASỊ NKE LIFE.CHURCH MA ỌBỤ̀ NDỊ MMANYE IWU MERÈ.

Ndabere Gị N'Ozi

Ozi enyerè na ma ọbụ̀ site na YouVersion bụ̀ nke emerè ka ọ dị́ naanị maka ihe eji ozi izugbe èmé. N'agbanyeghị na anyị nà-àgbalị inye ozi achọtarà na YouVersion na asụsụ dị iche iche, ntụgharị n'asụsụ gasị n'abụghị Bekee nke ọdịnaya YouVersion bụ̀ nke ana ènyé anyị site n'aka ndị ọzọ ma anyị adịghị egosipụta ma ọbụ̀ èkwú hoo haa na ntụgharị ndị ahụ enweghị mperi. Anyị adịghị así hoo haa na ozi a enweghị mperi, zuru ezu, ma ọbụ̀ baa uru. Ndabere ọbụla ị tụkwasịrị n'ụdị ozi dị́ otù ahụ bụ̀ naanị gị ka ọ gbàsárá. Anyị nà-asị na iwu amaghị anyị n'ụzọ ọbụla ma ọ dịghị ibú ọrụ ọbụla dịịrị anyị site na ndabere ọbụla atụkwasịrị n'ihe ndị ahụ site na gị ma ọbụ̀ onye ọbụla ọzọ n'abịa na YouVersion, ma ọbụ̀ onye ọbụla nwéré ike ịma gbàsará ọdịnaya ya nke ọbụla.

Ikike-Gasị Akụnụba Nke Uche

YouVersion na ọdịnaya ya, ihe-ngosi ya, na arụmọrụ ya (gụnyere ma n'enweghị ókè nye ozi niile, ngwanrọ, ederede, ngosipụta-gasị, onyonyo-gasị, vidiyo, na ọdịyo, na dìzaịn, nhọrọ, na nhazi nke yabụ́ otu ihe), bụ̀ nke Life.Church nwè, ndị n'enye ya ikike, ma ọbụ̀ ndị ọzọ n'enye ụdị ihe ahụ ma ha bụ̀ nke iwu United States na iwu ụwa bànyeré kọpịraịt, tredmakị, patentị, ihe nzuzo nke azụmahịa, na iwu ọbụla ọzọ nke n'echekwa akụnụba nke ọgụgụ-isi ma ọbụ̀ iwu-gasị bànyeré ikike ihe-onwe, nà-èchekwá.

Logò Na Dìzaịn Gasị

Aha YouVersion na logò ya, aha Life.Church na logò ya, App Icon logò, na aha niile metụtara ya, logò niile, ngwaahịa na aha savis-gasị, dìzaịn gasị, na slọgàn gasị bụ̀ tredmakị-gasị na/ma ọbụ̀ kọpịraịt nke Life.Church. Ị̀ kwesịghị iji maakị-gasị na kọpịraịt ndịa èmé ihe n'ebughị ụ̀zọ̀ nata ikike n'ụzọ édèrè èdé n'aka Life.Church. Aha ndị ọzọ niile, logò gasị, ngwaahịa na aha savis, dìzaịn gasị, na slọgàn gasị dị́ na YouVersion bụ̀ tredmakị-gasị nke ndị gasị nwe ha.

Mmebi Iwu Nke Kọpịraịt

Ọ bụrụ na ọ bụ̀ uche gị na Ntinye-Aka Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe ọbụla ma ọbụ̀ ọdịnaya ọzọ enyerè na YouVersion megiderè kọpịraịt gị ma ọbụ̀ ikike gị ndị ọzọ, biko kpọtụrụ ejentị anyị họpụtarà site n'ụzọ ndị a: (a) Mel na Dìpatmentị Iwu, Arụmọrụ-Gasị Life.Church, LLC, 4600 East 2nd Street, Edmond, Oklahoma 73034; (b) ekwentị na 405-680-5433; ma ọbụ̀ (c) ịmel na legal@life.church. Biko màrá na ọbụ̀ iwu Life.Church ịkwụsị arụmọrụ akaụntụ ndị n'eji ngwá èmé ihe n'emebi iwu akwụsịghị akwụsị.

Linkị-Gasị Ndị Ọzọ Na Savis-Gasị

YouVersion nwerè ike itinyè ọdịnaya ma ọbụ̀ linkị-gasị n'eduga na saịtị ndị ọzọ ma ọbụ̀ akụrụngwa gasị ndị ọzọ nyerè. Anyị enweghị nchịkwa n'elu ọdịnaya-gasị nke saịtị ndị ahụ ma ọbụ̀ akụrụngwa ha gasị, ma anyị adịghị anata ibu-ọrụ maka ha ma ọbụ̀ mfù ọbụla ma ọbụ̀ mmebi ọbụla nke nwéré ike isite na òjìjì ha n'aka gị. Ọ bụrụ na gị ekpebie inweta ohere na webụsaịtị gasị nke ọbụla nke ndị ọzọ jikọtara na YouVersion, ọ bụ̀ n'aka gị ka ihe niile dị̀ ma iwu-gasị na ọnọdụ gasị iwu deberè maka iji ha èmé ihe gà-achịkwa gị. Okwu niile e kwurù na/ma ọbụ̀ okwu-uche akọwapụtarà n'ihe ndịa, na ederede niile na nzaghachi-gasị enyerè ajụjụ gasị na ọdịnaya ọzọ, n'abụghị ọdịnaya enyerè site n'aka Life.Church, bụ̀ naanị okwu-uche gasị na ibu-ọrụ nke mmadụ ma ọbụ̀ ụlọ-ọrụ n'enye ihe ndị ahụ. Ihe ndịa adịghị ègosipụtá hoo haa ihe Life.Church bù n'uche. Anyị enweghị ibu-ọrụ nye gị ma ọbụ̀ iwu ọbụla amaa anyị n'ebe gị ma ọbụ̀ onye ọbụla ọzọ nọ maka ọdịnaya ma ọbụ̀ izi-ezi nke ihe ndị enyerè site n'aka ndị ọbụla ọzọ.

Mmachibido Gasị Nke Mpaghara

Life.Church bụ̀ na steeti Oklahoma dị́ n'ime United States ka ọ dị̀. Anyị adịghị èkwé nkwa na YouVersion ma ọbụ̀ ọdịnaya ya nke ọbụla bụ̀ nke apụrụ̀ ịnweta ma ọbụ̀ kwesị ekwesị na mpụga United States. Inweta ohere na YouVersion nwerè ike ịbụ́ nke iwu n'akwadoghị nye ụfọdụ ndị ma ọbụ̀ n'ụfọdụ obodo. Ọ bụrụ na gị enweta ohere na YouVersion site na mpụga United States, ọ bụ̀ site n'uche gị ka isi mee nke ahụ ma ibú-ọrụ bànyeré nrubeisi nye iwu-gasị nke obodo ịnọ na ya bụ̀ n'aka gị ka ọ dị̀.

Nkọwapụta Nke Ikike-Gasị

ÒJÌJÌ GỊ ÈMÉ IHE NKE YOUVERSION, ỌDỊNAYA YA, NA ARỤMỌRỤ ỌBỤLA, SAVIS GASỊ, MA ỌBỤ̀ IHE NDỊ ANATARÀ SITE NA YOUVERSION BỤ̀ NAANỊ GỊ KA Ọ GBASARÀ, HA NIILE BỤ́RỤ́ NKE ENYERÈ N'ỌNỌDỤ DỊKA “ESI HỤ YA” NA “DỊKA Ọ DỊ”, N'ENWEGHỊ ỤDỊ NKWA ỌBỤLA EKWERÈ N'ELU YA, AKỌWAPỤTARÀ MA ỌBỤ̀ AKỌWAPỤTAGHỊ. MA LIFE.CHURCH MA ONYE ỌBỤLA JIKỌTARA NA LIFE.CHURCH ADỊGHỊ ÈKWÉ NKWA ỌBỤLA MA ỌBỤ̀ ÈMÉ NGOSIPỤTA NYE IZU EZU, NCHEKWA, ARỤMỌRỤ KA O KWESỊRỊ, ỊDỊ MMA, IZI EZI, MA ỌBỤ̀ ỊDỊ ADỊ NKE YOUVERSION. N'ETINYEGHỊ ÓKÈ N'IHE NDỊA EKWURÙ N'ELU, MA LIFE.CHURCH MA ONYE ỌBỤLA JIKỌTARA NA LIFE.CHURCH ADỊGHỊ ÈMÉ NGOSIPỤTA MA ỌBỤ̀ ÈKWÉ NKWA ỌBỤLA NA YOUVERSION MA ỌBỤ̀ ARỤMỌRỤ ỌBỤLA NKE ỌDỊNAYA MA ỌBỤ̀ SAVIS-GASỊ ỌBỤLA MA ỌBỤ̀ IHE ANATARÀ SITE NA YOUVERSION GÀ ÈZÍ EZI, RỤỌ ỌRỤ KA O KWESỊRỊ, DỊ́ ENWEGHỊ MPERI, MA ỌBỤ̀ N'ARỤ ỌRỤ AKWỤSỊGHỊ AKWỤSỊ, NA AGA EMEZI IHE NDỊ N'ADỊGHỊ MMA NA YA, NA YOUVERSION MA ỌBỤ̀ SAVA N'ÉMÉ KA Ọ DỊ́ ADỊ ENWEGHỊ VAIRỌS GASỊ MA ỌBỤ̀ IHE NDỊ ỌBỤLA PỤRỤ IBUTE MMEBI, MA ỌBỤ̀ NA YOUVERSION MA ỌBỤ̀ SAVIS-GASỊ ỌBỤLA MA ỌBỤ̀ IHE ỌBỤLA ENWETARÀ SITE NA YOUVERSION GÀ EZUTE MKPA GỊ GASỊ MA ỌBỤ̀ ATỤMANYA GỊ GASỊ.

YA MERÈ LIFE.CHURCH NÀ-ÈWEPỤ̀ AKA HA N'ELU ỤDỊ NKWA ỌBỤLA NIILE, MA NKE EKWUPỤTARÀ MA NKE ANA EKWUPỤTAGHỊ, NKE IWU NA NKE N'ABỤGHỊ, GỤNYERE MA N'ENWEGHỊ ÓKÈ NYE NKWA GASỊ NKE AZỤMAHỊA, ADỊGHỊ MMEGIDE NYE IWU, NA IZI EZI MAKA IJI ÈMÉ IHE MAKA EBUMNOBI AKỌWAPỤTARÀ.

IHE NDỊA AKỌWAPỤTARÀ N'ELU ADỊGHỊ EMETỤTA NKWA ỌBỤLA NKE ANA APỤGHỊ IWEZỤGÀ MA ỌBỤ̀ ÈNYÉ ÓKÈ N'OKPURU IWU DỊ NỤ.

Ókè Na Ọmụma-Ikpe Maka Ịda Iwu

Ọ DỊGHỊ MGBE LIFE.CHURCH, NDỊ N'ENYE YA IKIKE, NDỊ N'ENYE YA SAVIS, MA ỌBỤ̀ NDỊ N'ARỤRỤ HA ỌRỤ, EJENTỊ HA GASỊ, NDỊ ISI HA, MA Ọ BỤ̀ NDỊ NCHỊKWA HA GÀ-ÀBỤ́ NDỊ IKPE MÀRÀ N'ANYA IWU MAKA ỤDỊ MMEBI ỌBỤLA, N'OKPURU NKỌWA IWU ỌBỤLA, N'ÉSÍ NA MA ỌBỤ̀ DỊ́ NJIKỌ NA ÒJÌJÌ GỊ, MA ỌBỤ̀ ÒJÌJÌ EKWEGHỊ GỊ ÈMÉ, YOUVERSION, WEBỤSAỊTỊ-GASỊ ỌBỤLA JIKỌTARA NA YA, ỌDỊNAYA ỌBỤLA ENYERÈ NA MA ỌBỤ̀ SITE NA YOUVERSION, MA ỌBỤ̀ WEBỤSAỊTỊ-GASỊ ỌBỤLA DỊ́ OTÙ AHỤ MA ỌBỤ̀ SAVIS-GASỊ MA ỌBỤ̀ IHE NDỊ ENWETARÀ SITE NA YOUVERSION, GỤNYERE KPỌMKWEM MA ỌBỤ̀ N'ỤZỌ ỌZỌ, PỤRỤ̀ ICHE, MÁNYERÉ AMANYE, BỤ̀ IHE SI NA, MA ỌBỤ̀ MMEBI METỤTARANỤ́, GỤNYERE, MA N'ENWEGHỊ ÓKÈ NYE, MMERỤ-AHỤ NKE ONWE, IHE MGBU NA NTARAMAHỤHỤ, EZUGHỊ-ÒKÈ NKE MMETỤTA-UCHE, MFÙ NKE EGO ACHỊKỌTARÀ, MFÙ NKE NRITE SI NA AZỤMAHỊA, MFÙ NKE AZỤMAHỊA MA ỌBỤ̀ EGO ATỤRỤ ANYA IME NCHEKWA, MFÙ NKE ÒJÌJÌ, MFÙ NKE IHU ỌMA, MFÙ NKE DATA, NA MA ỌBỤ̀ TORT KPATARA YA (GỤNYERE EMEGHỊ IHE EKWESỊRỊ IME), MMEBI NKE KỌNTRAKTỊ, MA ỌBỤ̀ N'ỤZỌ ỌBỤLA ỌZỌ, ỌBỤRỤGODI NA EKWESỊRỊ ỊHỤTA YA.

IHE NDỊA AKỌWAPỤTARÀ N'ELU ADỊGHỊ EMETỤTA ỌDỊDA ỌBỤLA N'ANYA IWU NKE ANA APỤGHỊ IWEZỤGÀ MA ỌBỤ̀ ÈNYÉ ÓKÈ N'OKPURU IWU DỊ NỤ.

Mkpuchi N'anya Iwu

Ịnà èkwenyé ikwuchitere, gbachite n'anya iwu, na isi na aka Life.Church dị̀ ọcha, ndị jikọtara na ya, ndị n'enye ya ikike, na ndị n'enye ya savis, na ndị isi ha, ndị nchịkwa ha, ndị ọrụ ha, ndị kọntraktị ha, ndị ejentị ha, ndị ha n'ènyé ikike, ndị n'enye ha ihe, ndị nnọchite ha, na ndị ha n'ekenye ihe gasị n'ihe gbàsará ikwu ego gasị n'ihi mmebi iwu, ọdịdà gasị n'anya iwu, ikwu ego gasị iwu manyerè ka akwụọ, ikpe gasị, ego iwu nyerè site n'aka ndị ọzọ, mfù gasị, ibu-ego gasị, mmefù gasị, ma ọbụ̀ ụgwọ gasị así kwụọ (gụnyere ụgwọ gasị ndị ọkà-iwu dị mma n'ezi uche) n'ésí na ma ọbụ̀ metụta mmebi i merè Iwu ndịa ma ọbụ̀ òjìjì gị nke YouVersion gụnyere, ma n'enweghị ókè nye, Ntinye-Aka gị Gasị Nke Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe, òjìjì ọbụla nke ọdịnaya YouVersion, savis-gasị, ma ngwaahịa gasị n'abụghị nke enyerè ikike kpọmkwem n'Iwu ndịa ma ọbụ̀ òjìjì gị nke ozi ọbụla enwetarà site na YouVersion.

Iwu N'Áchí Na Ikike Ọchịchị

Okwu niile, esemokwu niile, ma ọbụ̀ ụgwọ iwu si ka akwụọ metụtara YouVersion na Iwu ndịa (gụnyere esemokwu na ụgwọ iwu si kwụọ gasị n'abụghị nke kọntraktị), gà-àdị́ nchịkwa ma dị́ ndábà etù iwu-ime nke Steeti Oklahoma sìrì kaa n'eleghị anya ma ọbụ̀ menyere nhọrọ ọbụla ma ọbụ̀ esemokwu nke iwu ma ọbụ̀ ikike nyerè. Igba akwụkwọ ọbụla n'ụlọ ikpe, esemokwu ọbụla enwetarà n'ụlọ ikpe ma ọbụ̀ ihe-iwu ọbụla siteré na, ma ọbụ̀ metụta, Iwu ndịa ma ọbụ̀ YouVersion ka aga amalite n'enweghị mgbagha n'ụlọ ikpe Fedral gasị nke United States ma ọbụ̀ ụlọ-ikpe gasị nke Steeti Oklahoma n'ihe-ikpe ọbụla dị́ na Obodo-Ukwu bụ́ Oklahoma, Kauntị Oklahoma. Site n'ikwenye n'Iwu ndịa na iji YouVersion èmé ihe, ịnà ewepụ isi mbà ọbụla na niile nye nchịkwa n'elu gị site na ụlọ-ikpe ndị ahụ na gị ịbịa n'ebe ụlọ-ikpe ndị ahụ nọ̀.

Mwepụ Na Nkewa

Life.Church nwerè ike isi mbà nye, wepụ ma ọbụ̀ hapụ ike na ikike ha dị́ n'okpuru Iwu ndịa naanị n'edide. Ọ bụrụ na akụkụ ọbụla nke Iwu ndịa abụrụ nke ụlọ ikpe zuru ezu na nke iwu kwadorò sì na ha apụghị ịdị irè, ha darà iwu, ma ọbụ̀ apụghị itinyè ha n'ọrụ n'ụlọ ikpe ọbụla, akụkụ iwu ahụ gà-àbụ́ nke aga ewepụ ma ọbụ̀ mmachibido ya n'ụzọ gá-émé ka akụkụ ndị ọzọ nke iwu ndịa gà-àká nọgide ná-àdị́ irè ma na arụ ọrụ.

Nkwekọrịta Dum

Iwu ndịa na Iwu Nzuzo anyị bụ̀ nchịkọta dum nke nkwekọrịta dị́ n'etiti gị na Life.Church Operations, LLC nke metụtara YouVersion ma dị́ elu na ogo gafee nghọta gasị, nkwekọrịta gasị, nnọchiteanya gasị, ihe-iwu gasị, nke edere ede na nke ekwurù n'ọnụ, butere ụ̀zọ̀ ma ọbụ̀ dị́ adị ugbu a, gbasara YouVersion.

Okwu Ndị Ị Kwurù Na Nsogbu Ndị Ị Bù N'Uche

Ọ bụ̀ Life.Church Operations, LLC, limited liability kọmpínì dị́ na Oklahoma, nà-ènyé ma ná-èmé arụmọrụ YouVersion. Nzaghachi niile, okwu niile e kwurù, arịrịọ niile maka nkwado teknikal na nzikọrịta-ozi niile gbàsará YouVersion kwesịrị ịga na: YouVersion Support, 4600 E. 2nd St., Edmond, Oklahoma 73034 ma ọbụ̀ help@youversion.com.