Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka ONYENWE ANYị Chineke nna nna ya. ONYENWE ANYị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na ONYENWE ANYị bụ Chineke nʼezie.