1
2 Timoti 4:7
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa 2 Timoti 4:7
2
2 Timoti 4:2
kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.
Nyochaa 2 Timoti 4:2
3
2 Timoti 4:3-4
Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
Nyochaa 2 Timoti 4:3-4
4
2 Timoti 4:5
Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.
Nyochaa 2 Timoti 4:5
5
2 Timoti 4:8
Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.
Nyochaa 2 Timoti 4:8
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị