1
Ọrụ Ndị Ozi 4:12
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:12
2
Ọrụ Ndị Ozi 4:31
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:31
3
Ọrụ Ndị Ozi 4:29
Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:29
4
Ọrụ Ndị Ozi 4:11
Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:11
5
Ọrụ Ndị Ozi 4:13
Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:13
6
Ọrụ Ndị Ozi 4:32
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 4:32
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị