“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri,
“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.