1
Diuteronomi 4:29
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ ONYENWE ANYị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Diuteronomi 4:29
2
Diuteronomi 4:31
Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike.
Nyochaa Diuteronomi 4:31
3
Diuteronomi 4:24
Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.
Nyochaa Diuteronomi 4:24
4
Diuteronomi 4:9
Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
Nyochaa Diuteronomi 4:9
5
Diuteronomi 4:39
Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na ONYENWE ANYị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
Nyochaa Diuteronomi 4:39
6
Diuteronomi 4:7
Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka ONYENWE ANYị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?
Nyochaa Diuteronomi 4:7
7
Diuteronomi 4:30
Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute ONYENWE ANYị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.
Nyochaa Diuteronomi 4:30
8
Diuteronomi 4:2
Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka ONYENWE ANYị Chineke unu.
Nyochaa Diuteronomi 4:2
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị