1
Izikiel 18:32
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Izikiel 18:32
2
Izikiel 18:20
Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.
Nyochaa Izikiel 18:20
3
Izikiel 18:31
Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ?
Nyochaa Izikiel 18:31
4
Izikiel 18:23
Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?
Nyochaa Izikiel 18:23
5
Izikiel 18:21
“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
Nyochaa Izikiel 18:21
6
Izikiel 18:9
Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwubiri.
Nyochaa Izikiel 18:9
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị