1
Jenesis 35:11-12
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta. Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Jenesis 35:11-12
2
Jenesis 35:3
Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”
Nyochaa Jenesis 35:3
3
Jenesis 35:10
Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.
Nyochaa Jenesis 35:10
4
Jenesis 35:2
Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.
Nyochaa Jenesis 35:2
5
Jenesis 35:1
Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.”
Nyochaa Jenesis 35:1
6
Jenesis 35:18
Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.
Nyochaa Jenesis 35:18
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị