Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya.
“Ka Chineke, onye nna m ha
Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya
Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ
ogologo ndụ m niile ruo taa,
Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile,
ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a.
Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m
na aha nna m ha Ebraham na Aịzik,
ka ha mụbaa
hie nne nʼelu ụwa.”