Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;
otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,
anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.
Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya,
ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ,
ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.