1
Aịzaya 54:17
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu ONYENWE ANYị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Aịzaya 54:17
2
Aịzaya 54:10
Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka ONYENWE ANYị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
Nyochaa Aịzaya 54:10
3
Aịzaya 54:4
“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
Nyochaa Aịzaya 54:4
4
Aịzaya 54:5
Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
Nyochaa Aịzaya 54:5
5
Aịzaya 54:2
“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma.
Nyochaa Aịzaya 54:2
6
Aịzaya 54:13
Ụmụ gị niile ga-abụ ndị ONYENWE ANYị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
Nyochaa Aịzaya 54:13
7
Aịzaya 54:8
Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka ONYENWE ANYị, onye mgbapụta gị kwuru.
Nyochaa Aịzaya 54:8
8
Aịzaya 54:7
“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
Nyochaa Aịzaya 54:7
9
Aịzaya 54:9
“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
Nyochaa Aịzaya 54:9
10
Aịzaya 54:12
Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
Nyochaa Aịzaya 54:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị