ONYENWE ANYị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị.
Ha ga-abịakwute gị sị gị,
“Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie.
Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”