1
Jona 1:3
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu ONYENWE ANYị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu ONYENWE ANYị.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Jona 1:3
2
Jona 1:17
Ma ONYENWE ANYị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.
Nyochaa Jona 1:17
3
Jona 1:12
Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.”
Nyochaa Jona 1:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị