1
Maika 3:8
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke ONYENWE ANYị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Maika 3:8
2
Maika 3:11
Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na ONYENWE ANYị na-asị, “ONYENWE ANYị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
Nyochaa Maika 3:11
3
Maika 3:4
Mgbe ahụ ha ga-akpọku ONYENWE ANYị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
Nyochaa Maika 3:4
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị