1
Ilu 16:3
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka ONYENWE ANYị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 16:3
2
Ilu 16:9
Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ ONYENWE ANYị na-edu ije anyị.
Nyochaa Ilu 16:9
3
Ilu 16:24
Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
Nyochaa Ilu 16:24
4
Ilu 16:1
Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ ONYENWE ANYị.
Nyochaa Ilu 16:1
5
Ilu 16:32
Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
Nyochaa Ilu 16:32
6
Ilu 16:18
Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
Nyochaa Ilu 16:18
7
Ilu 16:2
Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma ONYENWE ANYị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
Nyochaa Ilu 16:2
8
Ilu 16:20
Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi.
Nyochaa Ilu 16:20
9
Ilu 16:8
Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
Nyochaa Ilu 16:8
10
Ilu 16:25
Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
Nyochaa Ilu 16:25
11
Ilu 16:28
Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
Nyochaa Ilu 16:28
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị