1
Abụ Ọma 10:17-18
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
O ONYENWE ANYị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 10:17-18
2
Abụ Ọma 10:14
Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
Nyochaa Abụ Ọma 10:14
3
Abụ Ọma 10:1
ONYENWE ANYị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
Nyochaa Abụ Ọma 10:1
4
Abụ Ọma 10:12
Bilie O ONYENWE ANYị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
Nyochaa Abụ Ọma 10:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị