1
Abụ Ọma 25:5
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 25:5
2
Abụ Ọma 25:4
O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.
Nyochaa Abụ Ọma 25:4
3
Abụ Ọma 25:14
ONYENWE ANYị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
Nyochaa Abụ Ọma 25:14
4
Abụ Ọma 25:7
Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, ONYENWE ANYị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
Nyochaa Abụ Ọma 25:7
5
Abụ Ọma 25:3
Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
Nyochaa Abụ Ọma 25:3
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị