1
Ndị Rom 12:2
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ndị Rom 12:2
2
Ndị Rom 12:1
Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
Nyochaa Ndị Rom 12:1
3
Ndị Rom 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.
Nyochaa Ndị Rom 12:12
4
Ndị Rom 12:21
Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.
Nyochaa Ndị Rom 12:21
5
Ndị Rom 12:10
Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.
Nyochaa Ndị Rom 12:10
6
Ndị Rom 12:9
Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.
Nyochaa Ndị Rom 12:9
7
Ndị Rom 12:18
Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.
Nyochaa Ndị Rom 12:18
8
Ndị Rom 12:19
Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
Nyochaa Ndị Rom 12:19
9
Ndị Rom 12:11
Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
Nyochaa Ndị Rom 12:11
10
Ndị Rom 12:3
Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.
Nyochaa Ndị Rom 12:3
11
Ndị Rom 12:17
Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.
Nyochaa Ndị Rom 12:17
12
Ndị Rom 12:16
Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
Nyochaa Ndị Rom 12:16
13
Ndị Rom 12:20
Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”
Nyochaa Ndị Rom 12:20
14
Ndị Rom 12:14-15
Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ. Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
Nyochaa Ndị Rom 12:14-15
15
Ndị Rom 12:13
Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.
Nyochaa Ndị Rom 12:13
16
Ndị Rom 12:4-5
Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.
Nyochaa Ndị Rom 12:4-5
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị