1
I. JỌN 5:14
Bible Nso
Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa I. JỌN 5:14
2
I. JỌN 5:15
ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n'ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n'aka-Ya.
Nyochaa I. JỌN 5:15
3
I. JỌN 5:3-4
N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́. N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.
Nyochaa I. JỌN 5:3-4
4
I. JỌN 5:12
Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.
Nyochaa I. JỌN 5:12
5
I. JỌN 5:13
Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ, bú ndi kwere n'aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi.
Nyochaa I. JỌN 5:13
6
I. JỌN 5:18
Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.
Nyochaa I. JỌN 5:18
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị