N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa.
Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.