Mọ Chineke we bata nimem mb͕e Ọ gwaram okwu, we me ka m'guzo n'ukwum abua; m'we nu otù Onye nāgwam okwu. O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n'okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n'ubọchi nke ta.