1
JENESIS 50:20
Bible Nso
Unu onwe-unu kwa, unu chere ihe ọjọ megidem; Chineke chere ya ka ọ buru ezi ihe, ime dika ọ di ta, idebe ọtutu ndi ndu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa JENESIS 50:20
2
JENESIS 50:19
Josef we si ha, Unu atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ?
Nyochaa JENESIS 50:19
3
JENESIS 50:21
Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.
Nyochaa JENESIS 50:21
4
JENESIS 50:17
Otú a ka unu gāsi Josef, Ariọm i, biko, b͕aghara njehie umu-nne-gi, na nmehie-ha, n'ihi na ọ bu ihe ọjọ ka ha meworo gi: ub͕u a kwa, biko, b͕aghara njehie ndi-orù Chineke nke nna-gi. Josef we kwa ákwá mb͕e ha gwara ya okwu.
Nyochaa JENESIS 50:17
5
JENESIS 50:24
Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya.
Nyochaa JENESIS 50:24
6
JENESIS 50:25
Josef we me ka umu Israel ṅua iyi, si, Chineke gēleta unu n'ezie, unu gēsi kwa n'ebe a bugo ọkpukpum.
Nyochaa JENESIS 50:25
7
JENESIS 50:26
Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.
Nyochaa JENESIS 50:26
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị