N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike. N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu.