1
AISAIA 65:24
Bible Nso
O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa AISAIA 65:24
2
AISAIA 65:17
N'ihi na, le, M'gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n'obi.
Nyochaa AISAIA 65:17
3
AISAIA 65:23
Ha agaghi-adọb͕u onwe-ha n'ọlu n'efu, ha agaghi-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n'ihi na nkpuru nke ndi Jehova gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi n'aru-ha puta.
Nyochaa AISAIA 65:23
4
AISAIA 65:22
Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.
Nyochaa AISAIA 65:22
5
AISAIA 65:20
Ọ dighi nwa ọhu nwuchuru anwuchu gēsite kwa n'ebe ahu ọzọ, ma-ọbu agadi nke nānọzughi ubọchi ndu-ya: n'ihi na nwata gānwu mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise, agākọcha kwa onye-nmehie mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise.
Nyochaa AISAIA 65:20
6
AISAIA 65:25
Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.
Nyochaa AISAIA 65:25
7
AISAIA 65:19
M'gēteghari kwa egwú ọṅù n'aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n'aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu.
Nyochaa AISAIA 65:19
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị