1
LEVITIKỌS 26:12
Bible Nso
M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa LEVITIKỌS 26:12
2
LEVITIKỌS 26:4
M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:4
3
LEVITIKỌS 26:3
Ọ buru na unu ejeghari n'ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, we me ha
Nyochaa LEVITIKỌS 26:3
4
LEVITIKỌS 26:6
M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:6
5
LEVITIKỌS 26:9
M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:9
6
LEVITIKỌS 26:13
Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:13
7
LEVITIKỌS 26:11
M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:11
8
LEVITIKỌS 26:1
Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:1
9
LEVITIKỌS 26:10
Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:10
10
LEVITIKỌS 26:8
Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:8
11
LEVITIKỌS 26:5
Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:5
12
LEVITIKỌS 26:7
Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:7
13
LEVITIKỌS 26:2
Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.
Nyochaa LEVITIKỌS 26:2
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị