Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:
Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;
Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;
Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,
Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;
Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,
Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù