1
ABÙ ỌMA 91:2
Bible Nso
M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:2
2
ABÙ ỌMA 91:1
Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:1
3
ABÙ ỌMA 91:15
Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya; Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu: M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:15
4
ABÙ ỌMA 91:11
N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi, Idebe gi n'uzọ-gi nile.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:11
5
ABÙ ỌMA 91:4
Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba: Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:4
6
ABÙ ỌMA 91:9-10
N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm; N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi; Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:9-10
7
ABÙ ỌMA 91:3
N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà, Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:3
8
ABÙ ỌMA 91:7
Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi; Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi; Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:7
9
ABÙ ỌMA 91:5-6
I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie; Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.
Nyochaa ABÙ ỌMA 91:5-6
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị