1
NKPUGHE 8:1
Bible Nso
Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n'elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa NKPUGHE 8:1
2
NKPUGHE 8:7
Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.
Nyochaa NKPUGHE 8:7
3
NKPUGHE 8:13
M'we hu, nu kwa otù ugo, ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, were kwa oké olu si, Ahuhu, ahuhu, ahuhu, ka ha gāhu, bú ndi bi n'elu uwa, site n'olu fọduru nke opì ndi-mọ-ozi atọ, ndi gaje ifù opì.
Nyochaa NKPUGHE 8:13
4
NKPUGHE 8:8
Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara
Nyochaa NKPUGHE 8:8
5
NKPUGHE 8:10-11
Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile; aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu.
Nyochaa NKPUGHE 8:10-11
6
NKPUGHE 8:12
Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.
Nyochaa NKPUGHE 8:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị