Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị Efesọs Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Pọl dere akwụkwọ a nʼoge ọ nọ nʼụlọ mkpọrọ na Rom nʼihi ikwusa oziọma. O dere ya igosi anyị ihe bụ ọnọdụ ndị niile kweere na Kraịst. Ha bụ ndị e jikọtara ọnụ na nzukọ Kraịst, bụ chọọchị, bụrụkwa ndị e jikọtara nʼotu nʼanụ ahụ Kraịst nʼonwe ya. Site na njikọta dị otu a ha abụrụla ndị Chineke hụrụ nʼanya, ndị ọ họpụtara site na ntọala ihe niile, ndị ọ nabatara nye onwe ya, ndị o mere ka ha na ya dịrị nʼudo, ndị ọ gbapụtara mee ka ha bụrụ agbụrụ e kere ọhụrụ, ndị e buliri elu, ndị a na-akwanyere ugwu, ndị nwere akụ ebighị ebi nʼeluigwe.
Usoro e si dee ya:
Nzube Chineke na nzọpụta nke onye Kraịst 1–2
Ịdị omimi nke oziọma 3
Ndụ nke onye Kraịst 4:1–5:20
Mmekọrịta nke ndị Kraịst 5:21–6:9
Ọgụ na mgba nke onye Kraịst 6:10-24

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye