41
1“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan
maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
2Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya
maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?
Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ
ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?
Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?
Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya
maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
8Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,
ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
9Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.
Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
10Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.
Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
11Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?
Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
12“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,
na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
13Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?
Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,
nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
15Azụ ya nwere ọta#41:15 Mpako ya bụ ọta azụ ya ndị e doro nʼusoro
nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
16nke ọbụla dị ibe ya nso,
na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
17E jikọtara ha ọnụ nke ọma,
ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
18Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;
anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
19Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,
icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,
dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.#41:20 Lit. Riidi
21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.
Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,
obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,
ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
24Obi ya dị ike dịka nkume,
dịka nkume e ji akwọ ihe.
25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;
ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
26O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,
o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
27Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;
bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
28Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,
ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
29Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,
ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
30Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,
nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
31Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;
ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
32Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;
mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
33O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,
o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
34Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.
Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”