Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Joshua 20

20
Obodo mgbaba
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis. 3Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ. 4Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha. 5Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere. 6Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
7Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh,#20:7 Jos 21:32; 1Ih 6:76 nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem,#20:7 Jos 21:21; 2Ih 10:1 nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba,#20:7 Jos 14:15; 21:11,13 nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda. 8Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta. 9Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Joshua 20: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye