Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYị. Gee ntị mgbe m na-akpọku gị ONYENWE ANYị. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, ONYENWE ANYị, ka m ga-achọ. Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
Gụọ Abụ Ọma 27
Geere nke a ntị Abụ Ọma 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 27:4-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị