Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 2

2
1Hana we kpe ekpere, si:
Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova,
Mpim adiwo elu n'ime Jehova:
Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom,
N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.
2Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;
N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:
Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.
3Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;
Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:
N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,
Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.
4Anyajiwo uta ndi-dike,
Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.
5Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;
Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:
Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;
Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.
6Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:
Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.
7Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:
Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.
8Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,
Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,
Ime ka ha na ndi-isi nọdu,
Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:
N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,
O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.
9Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,
Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri;
N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.
10Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu;
Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe:
Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe;
Ọ gēnye kwa eze-Ya ike,
Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.
11Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.
12Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova. 13Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya; 14o we dubà ya n'ite ọku, ma-ọbu n'ite isi miri, ma-ọbu n'ite isi anu, ma-ọbu n'ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n'ime Shailo, bú ndi nābia n'ebe ahu. 15Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n'aka-gi, kama anu ndu. 16Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike. 17Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.
18Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké. 19Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ. 20Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha. 21N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova.
22Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 23O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile. 24É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie. 25Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua 26Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n'iru, o we di nma, ma n'ebe Jehova nọ, ma n'ebe madu nọ.
27Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero? 28Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel? 29N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim? 30N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm. 31Le, ubọchi nābia, na M'gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n'ulo-gi. 32I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n'ebe-obibim, n'ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n'ulo-gi ubọchi nile. 33Ma nwoke nke diri gi, nke M'nāgaghi-ebipu n'ebe-ichu-àjàm, gābu ime ka anya-gi abua hubìe uzọ, na imekpa nkpuru-obi-gi aru: ọmùmù nile nke ulo-gi gānwu tutu ha erue agadi. 34Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu. 35Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile. 36Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 2: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye