Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 18

18
1Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta. 2Jetro, bú nna nwunye Moses, we were Zipora, bú nwunye Moses, mb͕e o zipusiri ya, 3na umu-ya ndikom abua; nke aha otù nime ha bu Giashom; n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'buworo n'ala ọzọ: 4aha nke ibe-ya bu kwa Elieza; n'ihi na ọ siri, Chineke nke nnam bu iye-akam, Ọ we naputam na mma-agha Fero: 5Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n'ugwu nke Chineke. 6Ọ si Moses, Mu onwem, nna nwunye-gi, bú Jetro, abiakutewom i, mu na nwunye-gi, na umu-ya ndikom abua tiyere ya. 7Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū. 8Moses we kọrọ nna nwunye-ya akukọ ihe nile Jehova mere Fero na ndi Ijipt n'ihi Israel, ike-ọgwugwu nile nke gwuru ha n'uzọ, Jehova we naputa ha. 9Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt. 10Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt. 11Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha. 12Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke. 13O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi. 14Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi? 15Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase: 16mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile. 17Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme. 18I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n'ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche. 19Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile, 20me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu. 21Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri: 22ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n'aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a. 23Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo. 24Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri. 25Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri. 26Ha we kpe ndi Israel ikpe na mb͕e nile: okwu nile nke siri ike ka ha nēwetara Moses, ma ha onwe-ha nēkpe okwu ntà nile. 27Moses we zipu nna nwunye-ya; o we je nke ya, la n'ala-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 18: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye