Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 24

24
1Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya: 2ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota. 3Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha. 4Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di. 5O zie umu-okorọbia nke umu Israel, ha we sure àjà-nsure-ọku, chiri kwa oke-ehi chuara Jehova àjà, bú àjà-udo. 6Moses we were nkera ọbara-ha, tiye n'ọkwa di iche iche; nkera ọbara-ha ka ọ wusara n'ebe-ichu-àjà. 7Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa. 8Moses we were ọbara ahu, wusa ya n'aru ndi Israel, si, Le, ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, nke Jehova b͕aworo n'ebe unu nọ bayere okwu ndia nile. 9Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel: 10ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha. 11Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.
12Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha. 13Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke. 14Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n'ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n'etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso. 15Moses we rigo n'ugwu ahu, igwe-oji ahu we kpuchie ugwu. 16Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa. 17Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel. 18Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 24: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye