Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 10

10
1M'we hu, ma, le, nime mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi cherubim, ihe dika nkume sapphire, dika oyiyi oche-eze si di n'ile ya anya, ka ahuru n'elu ha. 2O we gwa nwoke ahu nke yiri uwe ọcha okwu, si, Ba n'etiti ihe ahu nākpọre, n'okpuru cherub, kpojue icheku ọku nēre ere n'aka-gi abua site n'etiti cherubim, fesa ha n'elu obodo a. O we ba n'etiti ha n'anyam. 3Ma cherubim ahu nēguzo n'aka-nri nke ulo ahu, mb͕e nwoke ahu bàra; igwe-oji ahu juputa-kwa-ra ogige di nime. 4Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova. 5Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu. 6O rue, mb͕e O nyere nwoke ahu nke yiri uwe ọcha iwu, si, Si n'etiti ihe nke nākpọre, si n'etiti cherubim, guputa ọku, na ọ bàra, guzo n'akuku wheel. 7Cherub ahu we si n'etiti cherubim setipu aka-ya rue ọku ahu nke di n'etiti cherubim, were ufọdu tiye n'aka abua nke onye ahu nke yiri uwe ọcha, o we were ya pua. 8Ewe hu n'aru cherubim udi nke aka madu n'okpuru nkù-ha. 9M'we hu, ma, le, wheel anọ di n'akuku cherubim, otù wheel di n'akuku otù cherub, otù wheel di n'akuku otù cherub: wheel ahu n'ile ha anya di ka ib͕u-maramara nkume beryl si di. 10Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel. 11Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga. 12Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri. 13Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre. 14Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo. 15Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba. 16Ma mb͕e cherubim nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e cherubim nāchili nkù-ha isi n'elu uwa bulie onwe-ha elu, wheel-ha adighi-esi kwa n'akuku ha chigharia. 17Mb͕e cherubim nēguzo, wheel nēguzo; mb͕e cherubim nēbuli onwe-ha elu, wheel soro ha buli onwe-ha elu: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime ha. 18Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim. 19Cherubim we chilie nkù-ha, si n'ala bulie onwe-ha elu n'anyam mb͕e ha puru, wheel nile ha di kwa n'akuku ha: ha we guzo n'oghere nke ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova; ebube nke Chineke nke Israel di n'elu ha n'elu. 20Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu. 21Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha. 22Ma oyiyi nke iru-ha, ha onwe-ha bu iru nke m'huru n'akuku osimiri Keba, ka ha si di n'ile ha anya na ha onwe-ha; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZIKIEL 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye