Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 30

30
1Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m'bu. 2Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ? 3Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem. 4Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya. 5Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke. 6Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan. 7Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua. 8Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali. 9Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye. 10Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke. 11Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad. 12Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua. 13Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha. 14Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi. 15Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi. 16Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu, 17Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise. 18Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n'ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi' o we kpọ aha-ya Isaka. 19Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi. 20Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun. 21Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina. 22Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya. 23Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam: 24ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ.
25O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam. 26Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi. 27Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi. 28Ọ si kwa, Kparam ókè ugwọ-ọlu-gi, m'gēnye kwa gi. 29Ọ si ya, Gi onwe-gi amawo òfùfè m'fèworo gi, na ihe anu-ulo-gi ghọworo n'akam. 30N'ihi na nwanti ka ihe i nwere bu tutu mu abia, ma ọ basawo rue ọtutu; Jehova agọziwo kwa gi n'ije-ukwum: ma ub͕u a òle mb͕e ka mu onwem gēme-kwa-ra ulom? 31Ọ si, Gini ka m'gēnye gi? Jekob we si, I gaghi-enyem ihe ọ bula: ọ buru na i gēmerem ihe a, m'gāzù ìgwè ewu na aturu-gi ọzọ, debe kwa ya. 32M'gāgabiga n'etiti ìgwè ewu na aturu-gi nile taa, si n'ebe ahu wezuga aturu ọ bula turu agwa na ntupọ, na aturu ọ bula di nji n'etiti aturu, na nke turu ntupọ na agwa n'etiti ewu: ọ gābu ugwọ-ọlum. 33Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam. 34Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di. 35O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom; 36o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru. 37Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè. 38O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri. 39Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ. 40Jekob we wezuga umu-aturu, me ka ìgwè ewu na aturu che iru na nke dere ọcha na nke ọ bula di nji n'ìgwè ewu na aturu Leban; o we do ìgwè nke aka ya n'onwe-ha iche, ma o doghi ha n'ebe ìgwè ewu na aturu Leban di. 41O rue, mb͕e ọ bula ndi di ike nime ìgwè ewu na aturu turu ime, na Jekob tọb͕ọrọ nkpa-n'aka ahu n'iru anya ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri, ka ha we turu ime n'etiti nkpa-n'aka ahu; 42ma mb͕e ìgwè ewu na aturu nādighi ike, ọ dighi-atọb͕ọ ha: ndi nādighi ike we diri Leban, ma ndi di ike diri Jekob. 43Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 30: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye