Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 40

40
1O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na obu-ihe-ọṅuṅu nke eze Ijipt na osi-ite-ya mehiere megide onye-nwe-ha, bú eze Ijipt. 2Fero we we iwe megide madu abua ahu nējere ya ozi, megide onye-isi-ndi-obu-ihe-ọṅuṅu, megide kwa onye-isi ndi-osi-ite. 3Ọ we tiye ha n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n'ab͕u. 4Onye-isi ndi-ob͕ū we me ka Josef nēlekọta ha anya, ọ we jere ha ozi: ha nọ ubọchi ufọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ. 5Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n'otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n'ab͕u n'ulo-nkpọrọ. 6Josef we bakute ha n'ututu, hu ha, ma, le, iru nāb͕aru ha. 7Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa? 8Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m. 9Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum. 10alaka atọ di kwa n'osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha: 11iko Fero di kwa n'akam; m'were nkpuru-vine ahu, pinye ha n'iko Fero, nye iko ahu n'aka Fero. 12Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu; 13ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya. 14Ma otú ọ di chetam n'onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n'iru Fero, me ka m'si n'ulo a pua: 15n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a. 16Onye-isi ndi-osi-ite we hu na akukọ-isi nrọ a di nma, ọ we si Josef, Mu onwem di kwa na nrọm, ma, le, nkata atọ nke achicha ọcha di n'isim: 17ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n'elu isim. 18Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu; 19ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi. 20O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya. 21O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n'ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n'aka Fero: 22ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha. 23Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JENESIS 40: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye