Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 19

19
1Ibu eboro Ijipt.
Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya. 2M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze. 3Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa. 4M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta. 5Ọzọ, miri gātada n'oké osimiri, osimiri gātasia takọrọ. 6Osimiri-ya nile gēsì kwa ísì; osimiri Nail nile nke Ijipt gātalata we tasia: amì na achara gājanwu. 7Ala ahihia ndu n'akuku Nail, n'usọ Nail, na ebe ọ bula anāgha nkpuru n'akuku Nail, gātakọrọ, efesa ha, ha we ghara idi. 8Ndi-ọkù gēze kwa ume, ndi nile ndi nātubà nko-azù nime Nail gēru kwa újú, ndi nāb͕asa ub͕u n'elu miri gāta kwa aru. 9Ọzọ, ihere gēme ndi nālu ọlu flax etiri eti na ndi nākpa ákwà ọcha. 10Ide-ya nile gāghọ ihe etipiara etipia, ndi nile nke nālu ọlu inara ugwọ-ọlu gābu ndi erudara eruda na nkpuru-obí. 11Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m'bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie? 12Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt. 13Ndi-isi Zoan aghọwo ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, arafuwo ndi-isi Nof; ha edufuwo Ijipt, bú ndi ahu nke bu nkume nkuku nke ebo-ya nile. 14Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n'etiti ya: ha we dufue Ijipt n'ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n'ihe ọ b͕ọrọ. 15Ọ dighi kwa ọlu ọ bula Ijipt gēnwe, nke isi ma-ọbu ọdudù, ma-ọbu igu-nkwu ma-ọbu amì, gālu.
16N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya. 17Ala Juda gāghọ-kwa-ra Ijipt anya-ajù, onye ọ bula nke anēhotara ya Ijipt gātu oké egwu, n'ihi nzube nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēzube megide ya.
18N'ubọchi ahu obodo ise gādi n'ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha.
19N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova. 20Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha. 21Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya. 22Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.
23N'ubọchi ahu uzọ atuliri atuli gādi site n'Ijipt we rue Asiria, Asiria ewe ba n'Ijipt, Ijipt gābà kwa n'Asiria: ndi Ijipt gēsoro ndi Asiria fè òfùfè.
24N'ubọchi ahu ka Israel gēme Ijipt na Asiria atọ, ọ gābu ngọzi n'etiti uwa: 25n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha agọziwo ya, si, Onye agọziri agọzi ka ọ bu, bú Ijipt nke ndim, na Asiria nke bu ọlu akam abua, na Israel nke bu ihe-nketam.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 19: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye