Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 27

27
1N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.
2N'ubọchi ahu: Otù ubi-vine nke manya-vine nāsu ufufu, tienu nkpu ọṅù bayere ya. 3Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M'nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M'nēche ya. 4Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù. 5Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo. 6N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.
7Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya? 8N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu. 9N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ. 10N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile. 11Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.
12Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gētichapu nkpuru-ọka-Ya, site na miri nērù ọku ọku nke Osimiri rue miri-iyi Ijipt, ewe chikọta unu onwe-unu n'otù n'otù, unu umu Israel.
13Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 27: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye