Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 64

64
1Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri; 2dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n'iru Gi ma jijiji. 3Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n'iru-Gi rùda dika miri. 4Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu. 5I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n'uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi? 6Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe. 7Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi. 8Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu. 9Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu. 10Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n'efu. 11Ulo-ayi nke di nsọ nke ma-kwa-ra nma, ebe nna-ayi-hà toro Gi, aghọwo ihe nsure-ọku: ihe nile ayi anāchọsi ike aghọwo kwa nkpọnkpọ ihe. 12Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n'ala nke-uku?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

AISAIA 64: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye