Mb͕e ihe ndia gasiri otù ememe nke ndi-Ju di; Jisus we rigoro Jerusalem. Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise. Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu. N'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n'ọdọ-miri ntà ahu n'oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n'ọria ọ bula jidere ya.] Ma otù nwoke nọ n'ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya. Mb͕e Jisus huru onye a ka o nēdina, ebe Ọ ma-kwa-ra na ọ nọri ogologo oge n'ọnọdu ahu, Ọ si ya, Ì nāchọ ka eme ka aru di gi nma? Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida. Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari. Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu.
Gụọ JỌN 5
Geere nke a ntị JỌN 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 5:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị