LUK 3
3
1Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini, 2mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n'ọhia. 3O we bia n'ala nile di Jọ̀dan gburugburu, nēkwusa baptism nke nchèghari, ka ewe b͕aghara nmehie; 4dika edeworo ya n'akwukwọ okwu Aisaia onye-amuma, si,
Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si,
Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi,
Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.
5Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,
Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;
Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,
Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;
6Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.
7Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? 8Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia. 9Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 10Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me? 11O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu. 12Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me? 13Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu. 14Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.
15Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu, 16Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: 17Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.
18Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma; 19ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere, 20ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.
21Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe, 22Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.
23Ma Jisus onwe-ya, mb͕e Ọ malitere izí ihe, Ọ b͕ara ihe dika orú arọ na iri, buru Nwa Josef (dika echère), nwa Hili, 24nwa Matat, nwa Livai, nwa Melkai, nwa Janai, nwa Josef, 25nwa Matataias, nwa Emos, nwa Nehum, nwa Esli, nwa Nagai, 26nwa Meath, nwa Matataias, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda, 27nwa Joanan, nwa Risa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Nirai, 28nwa Melkai, nwa Adai, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Ia, 29nwa Jisus, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livai, 30nwa Simeon, nwa Judas, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Elaiakim, 31nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid, 32nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmon, nwa Nahshon, 33nwa Aminadab, nwa Admin, nwa Anai, nwa Hezron, nwa Perez, nwa Juda, 34nwa Jekob, nwa Aisak, nwa Abraham, nwa Tira, nwa Nehoa, 35nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Iba, nwa Shela, 36nwa Kainan, nwa Afaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lemek, 37nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan, 38nwa Enos, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
LUK 3: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

: