Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 76

76
Abu Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma Esaf, Abù.
1Onye amaworo na Juda ka Chineke bu:
N'Israel ka aha-Ya di uku.
2Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.
3N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;
Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah
4Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.
5Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha;
Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.
6Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,
Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.
7Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu:
Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?
8I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé;
Uwa turu egwu, we di jū,
9Mb͕e Chineke biliri ikpe ikpe,
Izọputa ndi nile di ume-ala n'obi nke uwa. Selah
10N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi:
I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.
11Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu:
Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.
12Ọ nēb͕ochi mọ ndi-ndú:
Ọ bu onye anātu egwu n'ebe ndi-eze uwa nọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 76: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye