ihe di kwa n'iru oche-eze ahu dika oké osimiri eji enyo me yiri crystal; ihe anọ nke di ndu nọ kwa n'etiti oche-eze ahu, nọ kwa oche-eze ahu gburugburu, ndi juputara n'anya anya n'iru na azu. Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe. Ihe anọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra nkù isi n'otù n'otù, ha juputa-kwa-ra n'anya anya gburugburu, ya na nime: ha adighi-ezu ike ehihie na abali, nāsi, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahu di, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye diri, Onye nādi kwa adi, Onye nābia kwa. Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi, Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.