I. NDI TESALỌNAIKA 1:2-3
I. NDI TESALỌNAIKA 1:2-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
I. NDI TESALỌNAIKA 1:2-3 Bible Nso (IGBOB)
Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere; ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi