II. IHE EMERE 32:7-8
II. IHE EMERE 32:7-8 Bible Nso (IGBOB)
Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya: nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.
Kesaa
Gụọ II. IHE EMERE 32II. IHE EMERE 32:7-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike. Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ ONYENWE ANYị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
Kesaa
Gụọ II. IHE EMERE 32